Numbers 33

Njegharị ụmụ Izrel

1Ndị a bụ usoro mbili ije ụmụ Izrel, site nʼoge ha hapụrụ Ijipt dịka ha si nọọ nʼigwe nʼigwe. Ọ bụ Mosis na Erọn duuru ha nʼije ndị a. 2Mosis, nʼonwe ya, dere usoro ije ha ndị a nʼakwụkwọ dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.

3Ha biliri njem site na Ramesis, nʼụbọchị nke iri na ise nʼọnwa nke mbụ, ụbọchị na-esota nke e mere Mmemme Ngabiga. Ha niile zọpụrụ ije nʼatụghị egwu nʼihu ndị Ijipt, 4mgbe ndị ha nọ na-eli ụmụ ha niile ndị e buru ụzọ mụọ, bụ ndị Onyenwe anyị tigburu nʼetiti ha nʼihi na Onyenwe anyị kpere chi ha niile ikpe.
5Ndị Izrel hapụrụ Ramesis, bịa maa ụlọ ikwu ha na Sukọt.
6Ha hapụrụ Sukọt bịaruo Etam, nke dị nʼọnụ ọnụ ọzara ahụ.
7Ha hapụrụ Etam laghachi azụ gaa Pi Hahirot, nke dị nso nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Baal-Zefọn, ebe ha manyere ụlọ ikwu ha na ndịda ugwu Migdol.
8Mgbe ha hapụrụ Pi Hahirot, ha sitere nʼetiti Osimiri Uhie gafee gaa ije ụbọchị atọ bata nʼọzara Etam. Ha manyere ụlọ ikwu ha na Mara.
9Mgbe ha hapụrụ Mara, ha batara Elim, ebe e nwere mmiri iri na abụọ si nʼala na-asọpụta, na iri osisi nkwụ asaa. Ha nọrọ ọdụ dị ukwuu nʼebe a.
10Mgbe ha hapụrụ Elim, ha wuru ụlọ ikwu ha nʼakụkụ Osimiri Uhie.
11Emesịa, ha hapụrụ Osimiri Uhie gaa maa ụlọ ikwu ha nʼọzara a na-akpọ Sin.
12Ha hapụrụ ọzara Sin gaa maa ụlọ ikwu ha na Dofka.
13Emesịa, ha hapụrụ Dofka bịaruo Alush maa ụlọ ikwu ha.
14Mgbe ha hapụrụ Alush, ha rutere Refidim, ebe ndị Izrel na-ahụghị mmiri ọṅụṅụ.
15Ha hapụrụ Refidim bịaruo nʼọzara Saịnaị ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
16Ha hapụrụ ọzara Saịnaị bịaruo Kibrọt Hataava ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
17Ha hapụrụ Kibrọt Hataava bịaruo Hazerọt ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
18Ha hapụrụ Hazerọt bịaruo Ritma ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
19Ha hapụrụ Ritma bịaruo Rimon-Perez ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
20Ha hapụrụ Rimon-Perez bịaruo Libna ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
21Ha hapụrụ Libna bịaruo Rissa ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
22Ha hapụrụ Rissa bịaruo Kehelata ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
23Ha hapụrụ Kehelata bịaruo nʼugwu Shefa ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
24Ha hapụrụ ugwu Shefa bịaruo Harada ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
25Ha hapụrụ Harada bịaruo Makhelot ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
26Ha hapụrụ Makhelot bịaruo Tahat ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
27Ha hapụrụ Tahat bịaruo Tera ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
28Ha hapụrụ Tera bịaruo Mitka ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
29Ha hapụrụ Mitka bịaruo Hashmona ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
30Ha hapụrụ Hashmona bịaruo Moserot ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
31Ha hapụrụ Moserot bịaruo Bene Jaakan ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
32Ha hapụrụ Bene Jaakan bịaruo Họ Hagịdgad ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
33Ha hapụrụ Họ Hagịdgad bịaruo Jotbata ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
34Ha hapụrụ Jotbata bịaruo Abrona ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
35Ha hapụrụ Abrona bịaruo Eziọn Geba ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
36Ha hapụrụ Eziọn Geba bịa maa ụlọ ikwu ha na Kadesh, nke dị nʼọzara Zin.
37Ha hapụrụ Kadesh bịa maa ụlọ ikwu ha nʼugwu Hor nʼoke ala ndị Edọm. 38Erọn, bụ onye nchụaja gbagoro nʼugwu Hor site nʼiwu Onyenwe anyị. Nʼebe ọ nọ nwụọ, nʼụbọchị mbụ nke ọnwa nke ise, nʼafọ nke iri anọ site na mgbe ụmụ Izrel si Ijipt pụta. 39Erọn gbara narị afọ na iri afọ abụọ na atọ mgbe ọ nwụrụ nʼugwu Hor.
40Onye Kenan bụ eze Arad, onye bi na Negev nʼime ala Kenan, nụrụ na ndị Izrel na-abịa.
41Ha hapụrụ ugwu Hor bịaruo Zalmona ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
42Ha hapụrụ Zalmona bịaruo Punon ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
43Ha hapụrụ Punon bịaruo Obot ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
44Ha hapụrụ Obot bịaruo Iye Abarim, nʼoke ala ndị Moab.
45Ha hapụrụ Iye Abarim bịaruo Dibọn Gad ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
46Ha hapụrụ Dibọn Gad bịaruo Almon Diblataim ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
47Ha hapụrụ Almon Diblataim bịaruo nʼugwu Abarim nke dị nso na Nebo ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
48Ha hapụrụ ugwu Abarim bata nʼobosara ala Moab nʼakụkụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu Jeriko, ebe ha mara ụlọ ikwu ha. 49Mgbe ha nọ nʼebe a, ha manyere ụlọ ikwu ha nʼebe dị iche iche nʼakụkụ osimiri Jọdan, site na Bet-Jeshimọt rute rịị ebe a na-akpọ Ebel-Shitim, nʼobosara ala Moab.

50Nʼobosara ala Moab, nʼakụkụ Jọdan, na ncherita ihu Jeriko ka Onyenwe anyị nọ gwa Mosis okwu sị ya, 51“Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Mgbe unu gafere osimiri Jọdan banye nʼala Kenan, 52unu aghaghị ịchụpụ ndị niile bi nʼebe ahụ ma bibie chi niile ha na-efe, ndị ha ji nkume tụọ na ndị ha kpụrụ akpụ. Unu ga-ebibikwa ebe niile dị nʼelu ugwu niile, ebe ha na-anọ efe arụsị ha niile ofufe. 53Nwetanụ ala ahụ, birikwa nʼime ya, nʼihi na enyela m unu ala ahụ ka unu nwere ya. 54Unu ga-eke ala ahụ site nʼife nza, dịka agbụrụ unu niile si dị. Ndị bara ụba nye ha ihe nketa dị ukwuu, ndị dị ole na ole nye ha ihe nketa dị nta. Ihe ọ bụla ruuru agbụrụ ọbụla site nʼife nza ga-abụ nke ha. Kee ya dịka ebo nna nna unu ha si dị.

55“ ‘Ma ọ bụrụ na unu achụpụghị ndị niile bi nʼala ahụ, ndị unu hapụrụ ga-abụrụ unu iberibe unyi nʼanya unu. Ha ga-adịkwara unu ka ogwu nke ga-adụkasị unu ahụ. Ha ga-enye unu nsogbu nʼala ahụ unu na-aga ibi nʼime ya. 56Mgbe ahụ kwa, aga m emeso unu ụdị mmeso ahụ m na-akwado imeso ha ugbu a.’ ”

Copyright information for IboBIU